Akụkọ dị mkpa - Ọktoba 19, 2026

Aha onyonyo, Akụkọ dị mkpa - Ọktoba 19, 2026
Akụkọ dị mkpa - Ọktoba 19, 2026
Mgbe e biputara ya

Gee ihe na-eme n'ụwa taa n'otu nkeji:

  • Archibishop Alexander Ibezim na-achịkọta ụlọụka Anglican na mpaghara Niger, onye bụkwa Bishop nke Dayọsisi Awka ekwuola na ya kpụpụrụ Primate ụlọụka Anglican na Nigeria bụ Most Rev. Henry Ndukuba nakwa Dean nke ụka ahụ n'ụlọikpe maka na ha kwụsịrị ya ọrụ n'ụzọ iwu na-akwadoghị.
  • Ka ọ dị, Dayọsisi Awka ajụla ịnabata ọrụ a kwụsịtụrụ Archibishop Alexander Ibezim ruo ọnwa isii, ma yie egwu na ha ga-ekewapụ onwe ha n'ụka Anglican nke Nigeria ma ọ bụrụ na okwu a gaa n'ihu.
  • Mba Kenya ekwuola na mmadụ anọ ndị ọhụrụ ebutela Ebola na mba ha, nke mere ka ọnụọgụ ndị butere ọrịa ahụ ugbua bụrụ mmadụ asaa, tinyere onye mbụ butere ya, ma mechaa nwụọ.
  • Ozi Mịnịstrị ahụike mba Kenya wepụtara kwuru na mmadụ atọ n'ime ndị ọhụrụ a butere ọrịa Ebola bụcha ndị ọrụ ahụike, bụ ndị lekọtara onye mbụ butere ọrịa a n'agbata ụbọchị 3 na 4 nke ọnwa Ọktoba, ebe onye nke anọ bụ nwanne onye ahụ nwụru anwụ.

Soyere anyị na websaịtị, Instagram, Facebook na WhatsApp chanelụ maka akụkọ niile na-eme n'ụwa.

Foto e dere Akụkọ dị mkpa
Pịa aka ebe a ka i soro BBC News Igbo na Whatsapp
Nkọwa foto, Pịa aka ebe a ka i soro BBC News Igbo na Whatsapp
BBC IGBO
Nkọwa foto, Whatsapp Chanelu BBC IGBO